Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Nabata Ndị Zara Anyị Òkù

Nabata Ndị Zara Anyị Òkù

N’abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa Mach, anyị na-atụ anya na ihe dị ka nde mmadụ iri na abụọ ma ọ bụ karịa ga-abịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs. Ha ga-amụta ọtụtụ ihe mgbe onye ga-ekwu okwu ga-eji Baịbụl kọwaa otú Jehova si jiri Ọkpara ya gbapụta anyị nakwa otú ihe a Jehova mere ga-esi baara anyị uru. (Aịza. 11:6-9; 35:5, 6; 65:21-23; Jọn 3:16) Ma, ọ bụghị naanị onye ahụ ga-ekwu okwu ga-agbara ndị ahụ anyị kpọrọ òkù àmà. Anyị niile ga-eso gbaara ha àmà. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịnabata ha nke ọma. (Rom 15:7) Ka anyị kwuo ihe ụfọdụ anyị nwere ike ime.

  • Kama ịga n’oche gị nọrọ na-eche ka a malite, gaa kelee ma ndị zara anyị òkù ma ụmụnna ndị na-anaghịzi abịa ọmụmụ ihe

  • Ka gị na ndị ị kpọrọ òkù na-akpa na-achị, chetakwa na e nwere ndị ọzọ zara anyị òkù i kwesịrị ịga kelee. I nwere ike ịkpọrọ onye bịara ọhụrụ ka gị na ya nọrọ. I nwekwara ike ịsape Baịbụl gị ma ọ bụ akwụkwọ abụ gị na-egosi ya

  • A gbasaa, gbalịa ka ị mata ma ò nwere ajụjụ ndị ọ chọrọ ka a zaa ya. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu ga-apụwa ozugbo unu mechara ka ọgbakọ ọzọ nwee ike ịnọ ebe ahụ mee nke ha, jụọ ya otú ị ga-esi ahụ ya ọzọ. Gbalịakwa gaa hụ ya ngwa ngwa. Ọ bụrụ na ị maghị ebe o bi ma ọ bụ nọmba ekwentị ya, i nwere ike ịsị ya: “M ga-achọ ịma otú i si hụ ihe omume a. Olee otú m ga-esi enweta gị ọzọ?”