Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ihe I Nwere Ike Ikwu

ỤLỌ NCHE

Ajụjụ: N’uche gị, olee onyinye kachanụ Chineke nyere anyị?

Amaokwu Baịbụl: Jọn 3:16

Otú a ga-esi enye ya: Ụlọ Nche a kwuru ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ mere Chineke ji zite Jizọs ka ọ bịa nwụọ maka anyị, nakwa otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ahụ o nyere anyị.

GỊNỊ BỤ ALAEZE CHINEKE?

Ajụjụ: [Gosi ya ihu traktị ahụ.] Gịnị ka ị ga-aza? Ị̀ ga-asị na ọ bụ ihe dị mmadụ n’obi? eluigwe? ka ọ̀ bụ ọchịchị dị n’eluigwe?

Amaokwu Baịbụl: Dan. 2:44; Aịza. 9:6

Otú a ga-esi enye ya: Traktị a kọwara otú Alaeze Chineke ga-esi baara gị uru.

AKWỤKWỌ ỊKPỌ ÒKÙ NCHETA ỌNWỤ JIZỌS

Otú a ga-esi enye ya: Anyị na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa otu nnọkọ dị mkpa anyị ga-enwe. [Nye ya akwụkwọ ịkpọ òkù.] N’Eprel 11, ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile ga-ezukọ iji cheta ọnwụ Jizọs ma gerekwa okwu a ga-eji Baịbụl kwuo gbasara otú ọnwụ ya ga-esi baara anyị uru. Ị ga-ahụ oge na ebe a ga-anọ eme ya n’akwụkwọ a. Anyị na-atụ anya gị n’ụbọchị ahụ.

DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ

Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.