Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Eji Broshọ Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa? Na-akụzi Ihe

Otú Anyị Ga-esi Eji Broshọ Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa? Na-akụzi Ihe

E bipụtara broshọ Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa? ka anyị na ndị anyị na-amụrụ ihe na-atụle ya tupu anyị ebido mụwa ihe ma ọ bụ mgbe anyị mụchara ihe. * Isi nke 1 ruo na nke 4 ga-enyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka ịmata ndị anyị bụ nke ọma. Isi nke 5 ruo na nke 14, ga-enyere ha aka ịmata gbasara ọrụ anyị na-arụ n’ụwa niile. Isi nke 15 ruo na nke 28 ga-akọwara ha otú e si hazie ọgbakọ anyị. Ọ kacha mma isi n’isi mụrụ ya ruo ná ngwụcha, ọ gwụkwala ma è nwere ezigbo ihe dị mkpa ga-eme ka unu họrọ otu isiokwu mụọ. E mere ka isiokwu nke ọ bụla ghara ịkarị otu peeji. N’ihi ya, e nwere ike iji ihe dị ka nkeji ise ma ọ bụ iri mụchaa ya.

  • Na-echetaghachiri onye ahụ ajụjụ ahụ a jụrụ n’isiokwu unu na-amụ

  • Gụchaanụ paragraf ndị dị n’isiokwu ahụ otu mgbe, ma ọ bụkwanụ unu agụọ ya ná nkebi ná nkebi

  • Kwurịtanụ ihe unu gụrụ. Jụọ ya ajụjụ ndị dị n’ala ala peeji, kọwaakwanụ foto ndị dị n’isiokwu ahụ. Gụọnụ ma kwụrịtanụ amaokwu Baịbụl ndị dị mkpa. Mee ka ọ mata otú isiokwu nta ndị dị na peeji unu na-amụ si zaa ajụjụ a jụrụ n’isiokwu ahụ

  • Ọ bụrụ na igbe e dere “Ihe Ọzọ Ị Ga-eme” dị n’isiokwu unu na-amụ, gụọnụ ya, gbaakwa ya ume ka o mee ihe e kwuru n’igbe ahụ

^ para. 3 Nke dị n’Ịntanet bụ nke kacha ọhụrụ.