Mach 20- 26
JEREMAYA 8-11
Abụ nke 117 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Ụmụ Mmadụ Ga-enwe Ọganihu Naanị Ma Jehova Duzie Ha”: (Nkeji 10)
Jere. 10:2-5, 14, 15—Chi mba dị iche iche na-efe bụ chi ụgha (it-1-E 555)
Jere. 10:6, 7, 10-13—Jehova adịghị ka chi mba dị iche iche. Ọ bụ naanị ya bụ ezi Chineke (w04 10/1 11 ¶10)
Jere. 10:21-23—Ụmụ mmadụ agaghị enweli ọganihu ma e wezụga nduzi Jehova (w15 9/1 15 ¶1)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Jere. 9:24—Olee ụdị ịnya isi na ụdị nganga nke dị mma? (w13 1/15 20 ¶16)
Jere. 11:10—Gịnị mere Jeremaya ji gụnye alaeze ebo iri nke dị n’ebe ugwu n’ihe o kwuru, n’agbanyeghị na Sameria adaala kemgbe afọ 740 T.O.N.K.? (w07 3/15 9 ¶7)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova?
Olee ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a nke ị ga-eji zie ndị mmadụ ozi ọma?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jere. 11:6-16
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Ozi Ụlọ n’Ụlọ: (Nkeji 2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Akwụkwọ ịkpọ òkù Ncheta Ọnwụ Jizọs na isiokwu wp17.2—Gwa ya ihe unu ga-atụle n’oge ọzọ.
Nletaghachi: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Akwụkwọ ịkpọ òkù Ncheta Ọnwụ Jizọs na isiokwu wp17.2—Gwa ya ihe unu ga-atụle n’oge ọzọ.
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 6 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) ld pp. 4-5 (Họrọ foto ndị nke unu ga-atụle.)—Kpọọ ya ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Otú Anyị Ga-esi Eji Broshọ Gee Chineke Ntị Na-akụzi Ihe”: (Nkeji 15) Jirinụ nkeji ise kwurịta ihe dị n’isiokwu ahụ. Kpọnyezie vidio gosiri otú e nwere ike isi jiri ihe dị na peeji nke 8 na nke 9 na broshọ a mụọrọ mmadụ ihe. Onye a na-amụrụ ihe ji Gee Chineke Ntị, onye na-amụrụ ya ihe ejiri Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi. Gbaa ndị na-ege ntị ume ka ha jiri Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi nke ha na-eso mgbe a na-ele vidio ahụ.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) kr isi nke 10 ¶1-7 na peeji nke 98-99
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 35 na Ekpere