Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Eji Broshọ Gee Chineke Ntị Na-akụzi Ihe

Otú Anyị Ga-esi Eji Broshọ Gee Chineke Ntị Na-akụzi Ihe

E bipụtara broshọ Gee Chineke Ntị ka anyị jiri ihe ndị e sere na ya na-akụziri ndị na-amachaghị ihe agụ eziokwu ndị dị mfe dị na Baịbụl. Nkebi ọ bụla na-adị peeji abụọ. Ha nwere foto ndị e leziri anya see, nweekwa ihe dị n’ahịrị dị n’akụkụ foto nke ọ bụla na-egosi foto ọzọ a ga-agafe na ya.

Ihe ndị e sere na Gee Chineke Ntị ka e sekwara na Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi. Ma, e dere ihe na Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi karịa otú e dere na nke ọzọ. E nwere ike inye onye matụ agụ ihe nke ahụ e dere ọtụtụ ihe na ya. Ndị nkwusa na-enwekarị mmasị iji Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi na-eduzi ọmụmụ ihe, ọ bụrụgodị na onye ha na-amụrụ ihe ji Gee Chineke Ntị. Ọtụtụ n’ime peeji ndị dị na ya na-enwe igbe ndị e dere ihe ndị ọzọ ha na onye ha na-amụrụ ihe nwere ike ikwurịta.

I nwere ike inye mmadụ broshọ nke ọ bụla n’ime broshọ abụọ a, ọ bụrụgodị na ọ bụghị akwụkwọ a na-enye n’ọnwa ahụ. I jiri ya na-eduzi ọmụmụ ihe, jiri foto ndị dị na ya kọwaa ihe unu na-amụ. Na-ajụ onye ị na-amụrụ ihe ajụjụ ka o nwee ike ịna-etinye ọnụ, ka ị marakwa ma ọ̀ na-aghọta ihe unu na-amụ. Gụọ ma kọwaa amaokwu Baịbụl dị n’ala ala peeji unu na-amụ. Unu mụchaa broshọ a, mụọnụ Gịnị Ka Bible Na-akụziri Anyị? iji nyere ya aka ka o ruo eru ime baptizim.