Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Nyere Ndị Ezinụlọ Gị Aka Ịna-echeta Jehova

Nyere Ndị Ezinụlọ Gị Aka Ịna-echeta Jehova

Jehova dunyere Jeremaya ozi ka ọ gaa dọọ ndị Juu aka ná ntị maka mbibi na-aga ịbịakwasị ha n’ihi na ha chefuru Chineke ha, bụ́ Jehova. (Jere. 13:25) Olee otú mba Izrel si bido lawa azụ n’ofufe Chineke? Ọ bụ n’ihi na ezinụlọ dị iche iche dị n’Izrel ejighịzi ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ọ ga-abụ na ihe kpatara ya bụ na ndị isi ezinụlọ nọ n’ezinụlọ ndị ahụ anaghị eme ihe iwu Jehova kwuru na Diuterọnọmi 6:5-7.

Taa, ọ bụ ezinụlọ dị iche iche ji ofufe Chineke kpọrọ ihe na-eme ka ọgbakọ Ndị Kraịst sie ike. Ndị isi ezinụlọ nwere ike inyere ezinụlọ ha aka ịna-echeta Jehova ma ọ bụrụ na ha a na-enwechi Ofufe Ezinụlọ anya. (Ọma 22:27) Unu lechaa vidio bụ́ Okwu Ndị A . . . Ga-adị n’Obi Gị”—Ajụjụ Ọnụ A Gbara Ezinulọ Ụfọdụ zaanụ ajụjụ ndị a:

  • Olee otú ezinụlọ ụfọdụ si merie nsogbu ndị na-egbochikarị ha inwe Ofufe Ezinụlọ?

  • Olee uru ụfọdụ inwechi Ofufe Ezinụlọ anya na-abara ezinụlọ?

  • A bịa n’Ofufe Ezinụlọ anyị, olee nsogbu ndị anyị na-enwe, oleekwa ihe ndị m ga-eme iji merie nsogbu ndị ahụ?