Ebe ụmụnna anyị na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs na Slovinia

USORO IHE OMUME OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ Mach 2018

Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta

Ihe ndị anyị nwere ike ikwu iji kpọọ ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs ma zaa ajụjụ ndị dị ka: Gịnị mere Jizọs ji nwụọ? Olee uru ihe mgbapụta ahụ ga-abara anyị?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

“Onye Ọ Bụla Nke Na-achọ Ịbụ Onye Ukwu n’Etiti Unu Aghaghị Ịbụ Onye Na-ejere Unu Ozi”

Ọrụ ndị anyị na-achọ ịrụ n’ọgbakọ, ọ̀ bụ naanị ndị ga-eme ka ndị ọzọ hụ anyị ma too anyị? Ọtụtụ mgbe, ọ bụ naanị Jehova na-ahụ ọrụ ọma onye Kraịst dị umeala n’obi na-arụ.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Na-erube Isi n’Iwu Abụọ Kachanụ

Olee iwu abụọ Jizọs kwuru na ọ bụ ha kacha na Baịbụl? Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-erube isi na ha?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Mụta Ịhụ Chineke na Ndị Agbata Obi Anyị n’Anya

Anyị kwesịrị ịhụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya. Otu ụzọ dị ezigbo mkpa anyị ga-esi amụta ya bụ ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Nọrọnụ na Nche n’Oge Ikpeazụ A

Ọtụtụ ndị taa ekwela ka ịchụso ihe ndị dị mkpa ná ndụ mee ka ha ghara inwekwa ohere maka ife Chineke. Olee otú Ndị Kraịst ji ofufe Chineke kpọrọ ihe si dị iche?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ọgwụgwụ Ụwa Ochie A Adịla Nso

Olee otú ihe Jizọs kwuru si gosi na ọgwụgwụ ụwa a adịla nso? A zara ajụjụ a na ndị ọzọ na vidio aha ya bụ Ọgwụgwụ Ụwa Ochie A Adịla Nso.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

“Na-echenụ Nche”

N’ihe atụ ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke, ònye ka nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ, ụmụ agbọghọ ndị ahụ nwere uche, na ụmụ agbọghọ ndị ahụ dị nzuzu nọchiri anya ha? Gịnị ka ihe atụ a na-akụziri gị?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma​—⁠Ịkụziri Onye Anyị Na-amụrụ Ihe Ịkwadebe Ihe A Ga-amụ

Anyị kwesịrị ibido ozugbo anyị malitere ịmụrụ mmadụ Baịbụl kụziwere ya otú e si akwadebe ihe a na-amụ. Olee otú e nwere ike isi mee ya?