Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 22-23

Na-erube Isi n’Iwu Abụọ Kachanụ

Na-erube Isi n’Iwu Abụọ Kachanụ

22:36-39

Jiri ihe ị gụtara na Matiu 22:36-39 denye ihe n’okpuru ebe a. Dee 1, n’ihe kacha mkpa mere i ji aga ọmụmụ ihe; 2 na nke na-eso ya, 3 na nke ikpeazụ:

  • Iji nweta agbamume

  • Iji gbaa ndị ọzọ ume

  • Iji fee Jehova ma gosi na ị hụrụ ya n’anya

Olee ihe mere anyị kwesịrị iji gbalịa gaa ọmụmụ ihe, ọ bụrụgodị na ike gwụchara anyị, ya adịkwa anyị ka ịga ya agaghị abachara anyị uru?

Olee ụzọ ndị ọzọ anyị nwere ike isi gosi na anyị na-erube isi n’iwu abụọ ndị ahụ kachanụ?