Mach 26–Eprel 1
MATIU 25
Abụ nke 143 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Na-echenụ Nche”: (Nkeji 10)
Mat. 25:1-6—Ụmụ agbọghọ ise ahụ nwere uche na ụmụ agbọghọ ise ahụ dị nzuzu gara izute nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ
Mat. 25:7-10—Ụmụ agbọghọ ahụ dị nzuzu anọghị ya mgbe nwoke ahụ na-alụ nwaanyị bịara
Mat. 25:11, 12—Naanị ụmụ agbọghọ ndị nke nwere uche banyere n’oriri alụmdi na nwunye ahụ
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Mat. 25:31-33—Kọwaa ihe atụ ahụ Jizọs mere banyere atụrụ na ewu. (w15 3/15 27 ¶7)
Mat. 25:40—Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na ụmụnna Kraịst bụ enyi? (w09 10/15 16 ¶16-18)
Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?
Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Mat. 25:1-23
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Nletaghachi nke Abụọ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị n’ebe e dere “Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta.” Gwa onye ahụ ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs.
Nletaghachi nke Atọ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Họrọ amaokwu Baịbụl ị chọrọ. Nye ya akwụkwọ e ji amụ Baịbụl.
Okwu: (Nkeji 6 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) w15 3/15 27 ¶7-10—Isiokwu: Olee Otú Ilu Gbasara Atụrụ na Ewu Si Gosi na Ikwusa Ozi Ọma Dị Ezigbo Mkpa?
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Ịkụziri Onye Anyị Na-amụrụ Ihe Ịkwadebe Ihe A Ga-amụ”: (Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. E mechaa, kpọnye vidio gosiri ebe onye nkwusa na-akụziri onye ọ na-amụrụ ihe otú ọ ga-esi na-akwadebe ihe ha ga-amụ. Gwa ụmụnna ka ha kwuo ụzọ ndị ọzọ ha sirila mee ya.
Nabata Ndị Anyị Kpọrọ Òkù: (Nkeji 5) Okwu. Ọ ga-esi n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị nke Mach afọ 2016. Kọọ ihe ọma ụfọdụ mere n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ 2017. Chetaghachiri ụmụnna ihe ụfọdụ gbasara ịdọwa ụgbọala, ịpụ na ịbata n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na ihe ndị ọzọ dị mkpa n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs na Mach 31.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 14
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 79 na Ekpere