Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma​—⁠Ịkụziri Onye Anyị Na-amụrụ Ihe Ịkwadebe Ihe A Ga-amụ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma​—⁠Ịkụziri Onye Anyị Na-amụrụ Ihe Ịkwadebe Ihe A Ga-amụ

IHE MERE O JI DỊ MKPA: Ịkwadebe ihe a ga-amụ ga-enyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka ịghọta na icheta ihe anyị na-akụziri ha ngwa ngwa. Ọ ga-emekwa ka ha na-enwe ọganihu ngwa ngwa. Ha mechagodị baptizim, ha ka kwesịrị ịna-akwadebe ọmụmụ ihe na ozi ọma iji nọgide ‘na-eche nche.’ (Mat. 25:13) N’ihi ya, ịma otú e si amụ ihe na inwe oge ha ji amụ ihe ga-abara ha uru ná ndụ ha niile. Anyị kwesịrị ibido ozugbo anyị malitere ịmụrụ mmadụ Baịbụl kụziwere ya otú e si akwadebe ihe a na-amụ.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Na-eme ihe ahụ ị chọrọ ka ha na-eme. (Rom 2:21) Na-akwadebe ihe ọ bụla unu ga-amụ. Buru onye ị na-amụrụ ihe n’obi na-akwadebe ya. (km 11/15 3) Gosi ya ebe ị katụrụ ihe n’akwụkwọ nke gị

  • Gbaa ya ume ka ọ na-akwadebe ihe unu ga-amụ. Ozugbo unu malitere ịmụ ihe, mee ka ọ mata na o so n’ihe onye ọ bụla anyị na ya na-amụ Baịbụl kwesịrị ịna-eme, kọwaakwara ya uru ọ na-aba. Gwa ya ihe ndị ga-enyere ya aka ịna-ewepụta oge ọ ga-eji na-amụ ihe. Ụfọdụ ndị nkwusa na-enye onye ha na-amụrụ ihe akwụkwọ nke ha ha katụrụ ihe na ya iji nyere ha aka ịghọta uru ọ bara ịkwadebe ihe ha ga-amụ. Jaa onye ahụ mma ma ọ bụrụ na ọ kwadebe ihe unu ga-amụ

  • Gosi ya otu ọ ga-esi akwadebe ihe unu ga-amụ. Ihe ụfọdụ ụmụnna na-eme ma ha malite ịmụrụ mmadụ ihe bụ iji otu ụbọchị kụziere onye ahụ otú e si akwadebe ihe ha ga-amụ