Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 25

“Na-echenụ Nche”

“Na-echenụ Nche”

25:1-12

Ọ bụ eziokwu na Jizọs bu ndị e tere mmanụ n’obi mee ihe atụ ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke, ma, ihe ọ na-akụzi gbasakwara Ndị Kraịst niile. (w15 3/15 12-16) Baịbụl, sịrị: “Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa ọ ga-abụ.” (Mat. 25:13) Ị̀ ga-akọwali ihe atụ a Jizọs mere?

  • Nwoke Na-alụ Nwaanyị Ọhụrụ (amaokwu nke 1)—Jizọs

  • Ụmụ agbọghọ nwere uche, dịkwa njikere (amaokwu nke 2)—Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị dị njikere iji obi ha niile na-arụ ọrụ e nyere ha ma na-enwu ka ndị na-enye ìhè ruo ọgwụgwụ (Fil. 2:15)

  • Mkpu ahụ: “Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ abịala!” (amaokwu nke 6)—Ihe gosiri ọnụnọ Jizọs

  • Ụmụ agbọghọ nzuzu (amaokwu nke 8)—Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị gawara izute Nwoke Ahụ Na-alụ Nwaanyị Ọhụrụ ma ha anọgideghị na nche, ha anọgideghịkwa na-ekwesị ntụkwasị obi

  • Ụmụ agbọghọ ndị ahụ nwere uche jụrụ inyetụ ndị nke ọzọ mmanụ ha (amaokwu nke 9)—A kachaa ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi akara ikpeazụ, oge agaghịzi adị ha ga-eji enyere ndị nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi aka

  • “Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ bịarutere” (amaokwu nke 10)—Jizọs ga-abịa ikpe ikpe ná ngwụcha oké mkpagbu ahụ

  • Ụmụ agbọghọ ndị ahụ nwere uche sooro nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ banye n’oriri alụmdi na nwunye ahụ, e mechie ụzọ (amaokwu nke 10)—Jizọs ga-akpọrọ ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi gaa eluigwe, ma, ndị nke ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi agaghị aga eluigwe