Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta

Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta

●○○ MKPARỊTA ỤKA NKE MBỤ

Ajụjụ: Gịnị ka Chineke bu n’obi kee mmadụ?

Amaokwu Baịbụl: Jen. 1:28

Ajụjụ A Ga-aza n’Oge Ọzọ: Olee otú anyị si mara na Chineke ga-emezu ihe o bu n’obi kee mmadụ?

○●○ NLETAGHACHI NKE MBỤ

Ajụjụ: Olee otú anyị si mara na Chineke ga-emezu ihe o bu n’obi kee mmadụ?

Amaokwu Baịbụl: Aịza. 55:11

Ajụjụ A Ga-aza n’Oge Ọzọ: Olee otú ihe ga-adị mgbe Chineke mezuru ihe o bu n’obi kee mmadụ?

○○● NLETAGHACHI NKE ABỤỌ

Ajụjụ: Olee otú ihe ga-adị mgbe Chineke mezuru ihe o bu n’obi kee mmadụ?

Amaokwu Baịbụl: Ọma 37:​10, 11

Ajụjụ A Ga-aza n’Oge Ọzọ: Olee ihe anyị kwesịrị ime iji rite uru ná nkwa ndị Chineke kwere?

OTÚ ANYỊ GA-ESI AKPỌ NDỊ MMADỤ KA HA BỊA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS (Mach 23-Eprel 19):

Anyị na-akpọ gị ka ị bịa otu nnọkọ dị mkpa anyị ga-enwe n’abalị iri na itoolu n’ọnwa Eprel. Nke a bụ akwụkwọ ịkpọ òkù nke gị. N’ụbọchị ahụ, ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile ga-ezukọ iji cheta ọnwụ Jizọs Kraịst. Ị ga-ahụ oge na ebe anyị ga-anọ eme ya n’akwụkwọ a. Anyị na-akpọkwa gị ka ị bịa gere okwu a ga-eji Baịbụl kwuo n’izu bu ya ụzọ. Isiokwu ya bụ: “Gbalịa Nweta Ndụ Ahụ nke Bụ́ Ndụ n’Ezie.”

Ajụjụ A Ga-aza n’Oge Ọzọ: Gịnị mere Jizọs ji nwụọ?