Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Akwụkwọ Ozi Ị Ga-elere Anya Dee nke Gị

Akwụkwọ Ozi Ị Ga-elere Anya Dee nke Gị
  • Denye adres gị. E DENYEKWALA adres alaka ụlọ ọrụ unu.

  • Denye aha onye ahụ ma ọ bụrụ na ị ma ya, ka onye ahụ mata na ọ bụ yanwa ka e detaara ya.

  • Chebara okwu ndị ị na-ede echiche, supee okwu ọ bụla nke ọma, tinyekwa akara edemede kwesịrị ekwesị. Akwụkwọ ozi ahụ kwesịrị ịdị mma n’anya. Ọ bụrụ na i ji aka dee ya, jiri aka akwụkwọ dị mma dee ya ka o kwe ọgụgụ. Ka okwu ndị i ji dee ya gharakwa ịdị ka ị na-enye iwu ma ọ bụkwanụ na ihe ị na-ekwu adịchaghị mkpa.

Akwụkwọ ozi a dị n’aka nri gosiri otú e nwere ike isi mee ihe ndị a anyị kwuru banyere ha. Ọ dịghị mkpa ka i were ihe niile e dere na ya dee na nke gị. Kama, dee akwụkwọ ozi gị ka ọ daba n’ihe i bu n’obi na-ede ya.