Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma​—Otú E Si Ede Akwụkwọ Ozi Dị Mma

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma​—Otú E Si Ede Akwụkwọ Ozi Dị Mma

IHE MERE O JI DỊ MKPA: Ndị Kọrịnt nke Mbụ so n’otu n’ime akwụkwọ ozi iri na anọ Pọl dere o ji gbaa Ndị Kraịst ibe ya ume. Uru akwụkwọ ozi bara bụ na ọ na-enye onye na-ede ya ohere ihazi okwu ya nke ọma. Uru ọzọ ọ bara bụ na onye na-agụ ya nwekwara ike ịgụ ya ugboro ole ọ bụla ọ chọrọ. Ide akwụkwọ ozi bụ otu ụzọ magburu onwe ya mmadụ nwere ike isi zie ndị ikwu ya na ndị ọzọ ozi ọma. Ọ bụkwa ụzọ magburu onwe ya isi zie ndị anyị na ha na-agaghị ahụli ihu na ihu ozi ọma. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ị bụ onye e ziri ozi ọma ya egosi mmasị, ma a naghị ahụ ya n’ụlọ. E nwekwara ụfọdụ ndị anyị na-agaghị ahụli zie ozi ọma n’ihi na ha bi n’ụlọ ndị e tinyere ndị nche, n’ebe ndị a gbara ogige ma ọ bụ n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ. Ma, olee ihe ụfọdụ anyị kwesịrị iburu n’obi, karịchaa mgbe anyị na-edegara onye anyị na-amaghị akwụkwọ ozi?

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Dee ihe ị gaara agwa onye ahụ ma a sị na gị na ya hụrụ ihu na ihu. Buru ụzọ kọwaara ya onye ị bụ na ihe mere i ji na-edetara ya akwụkwọ ozi. I nwere ike jụọ ya ajụjụ ọ ga-echebara echiche ma gwa ya banyere adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig. Gwa ya na anyị na ya nwere ike ịmụ Baịbụl ma ọ bụrụ na ọ chọọ, gwakwa ya banyere isiokwu ụfọdụ si n’otu n’ime akwụkwọ ndị anyị ji amụrụ ndị mmadụ ihe. I nwekwara ike itinye akwụkwọ, kaadị jw.org, akwụkwọ ịkpọ òkù ma ọ bụ traktị n’ime akwụkwọ ozi ahụ

  • Mee ka akwụkwọ ozi gị dị nkenke ka ike ghara ịgwụ onye i deere ya ịgụ ya​—Lee akwụkwọ ozi ị ga-elere anya dee nke gị na peeji nke 8

  • Gụgharịa ya iji mara ma ò nwere ihe ị ga-emezi na ya, nakwa ma ọ̀ dị mfe ọgụgụ. Gbalịa mee ka okwu gị dịrị ka okwu enyi na-agwa enyi ya, ka ahụ́ nwee ike iru onye na-agụ ya ala.