Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ KỌRỊNT 4-6

“Ntakịrị Ihe Iko Achịcha Na-eme Ka Ntụ Ọka Dum A Gwakọtara Agwakọta Koo Eko”

“Ntakịrị Ihe Iko Achịcha Na-eme Ka Ntụ Ọka Dum A Gwakọtara Agwakọta Koo Eko”

5:1, 2, 5-11, 13

Olee otú ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ si egosi na Jehova hụrụ anyị n’anya ebe ọ bụ na ọ na-ewute ewute?

Ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ gosiri na anyị hụrụ . . .

  • Jehova n’anya n’ihi na anyị chọrọ ime ka aha ya dị nsọ.​—1 Pita 1:​15, 16

  • ọgbakọ n’anya n’ihi na anyị wepụrụ ihe ga-emebi ya.​—1 Kọr. 5:6

  • onye mere mmehie n’anya n’ihi na anyị chọrọ inyere ya aka ka o chegharịa.​—Hib. 12:11

Olee otú i nwere ike isi nyere ndị ezinụlọ onye a chụrụ n’ọgbakọ aka ime ihe Baịbụl kwuru?