Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jiri Vidio Na-akụziri Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Ihe

Jiri Vidio Na-akụziri Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Ihe

Iji ihe a na-ahụ anya akụzi ihe na-eme ka uche mmadụ dịrị n’ihe a na-akụziri ya, na-emekwa ka ọ ghọta ma na-echeta ya. Onye ozizi anyị kachanụ bụ́ Jehova ejirila ihe a na-ahụ anya kụzie ọtụtụ ihe dị mkpa. (Jen. 15:5; Jere. 18:​1-6) Onye Ozizi Ukwu bụ́ Jizọs mekwara otu ihe ahụ. (Mat. 18:​2-6; 22:​19-21) Otu ihe a na-ahụ anya kacha eru ndị mmadụ n’obi taa bụ vidio. Ị̀ na-eji vidio akụziri ndị ị na-amụrụ Baịbụl ihe?

E nwere vidio iri e mepụtara ga-enyere anyị aka ịkụziri ndị mmadụ isiokwu ndị dị na broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Aha vidio nke ọ bụla na ụfọdụ ajụjụ e dere n’aka akwụkwọ gbara okpotokpo na broshọ a bụ otu. Na broshọ a nke dị n’Ịntanet, e nwere ihe ndị ga-enyere anyị aka ịmata mgbe e kwesịrị ile vidio nke ọ bụla. E nwekwara vidio ndị ọzọ kọwara ihe ndị dị n’akwụkwọ ndị ọzọ anyị ji amụrụ ndị mmadụ ihe.

Gị na onye ị na-amụrụ ihe ùnu na-amụ isiokwu na-esiri ya ike nghọta? Ka ò nwere nsogbu ya na ya na-alụ? Gaa na jw.org/ig ma ọ bụ n’ihe omume tiivi anyị chọta vidio ga-enyere ya aka. Gị na onye ahụ nwekwara ike iso lee otu n’ime vidio ndị ahụ ma kwurịta ihe unu mụtara na ya.

Kwa ọnwa, a na-ewepụta vidio ndị ọhụrụ. Ka ị na-ele ha, chee otú i nwere ike isi jiri nke ọ bụla n’ime ha kụziere mmadụ ihe.