Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ ROM 12-14

Otú Ndị Kraịst Si Egosi Ịhụnanya

Otú Ndị Kraịst Si Egosi Ịhụnanya

12:10, 17-21

Ọ bụrụ na mmadụ emejọọ anyị, ọ bụghị naanị na ịhụnanya ga-eme ka anyị ghara imegwara onye ahụ, kama, ọ ga-eme ka anyị meere onye ahụ ihe ọma. Ndị Rom 12:20 kwuru, sị: “Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri; ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ; n’ihi na site n’ime nke a, ị ga-ekpokwasị icheku ọkụ n’isi ya.” Iji obiọma mesoo onye mejọrọ anyị ihe nwedịrị ike ime ka ihe ahụ o mere anyị wute ya.

Olee otú obi dị gị mgbe onye i mejọrọ n’amaghị ama meere gị ihe ọma n’agbanyeghị ihe i mere ya?