Mach 16-22
JENESIS 25-26
Abụ nke 18 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Isọ Rere Ọnọdụ Ya Dị Ka Diọkpara”: (Nkeji 10)
Jen. 25:27, 28—Isọ na Jekọb bụ ejima, ma àgwà ha na ihe ndị ha na-enwe mmasị ime dị iche iche (it-1 1242)
Jen. 25:29, 30—Isọ kwere ka agụụ na ike ọgwụgwụ dufuo ya
Jen. 25:31-34—Isọ ji ọkụ ọkụ resị Jekọb ọnọdụ ya dị ka diọkpara n’ihi otu efere nri (w19.02 16 ¶11; it-1 835)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
Jen. 25:31-34—Gịnị mere ihe e kwuru n’amaokwu ndị a anaghị egosi na ọ bụ naanị ndị bụ́ ọkpara ka a ga-esi na ha mụta Mesaya? (Hib. 12:16; w17.12 15 ¶5-7)
Jen. 26:7—Gịnị mere Aịzik ekwughị eziokwu niile n’ebe a? (it-2 245 ¶6)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova Chineke, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jen. 26:1-18 (th ihe ọmụmụ nke 5)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Vidio Nletaghachi nke Mbụ: (Nkeji 5) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio ahụ ma jụọ ajụjụ ndị a: Olee otú anyị ga-esi zere imenye onye nwe ụlọ ihere ma ọ bụrụ na ọ zataghị ajụjụ a jụrụ ya? Olee otú onye nkwusa ahụ si jiri Matiu 20:28 kụzie ihe nke ọma?
Nletaghachi nke Mbụ: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jiri ihe dị na peeji nke mbụ mee ya. (th ihe ọmụmụ nke 3)
Nletaghachi nke Mbụ: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ, gị enyezie ya akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị. (th ihe ọmụmụ nke 15)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Jiri Vidio Na-akụziri Ndị Mmadụ Ihe Ma Unu Mụwa Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio bụ́ Gịnị Na-eme Ndị Mmadụ Ma Ha Nwụọ? na Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ahụhụ Dịrị?. E lechaa vidio nke ọ bụla, jụọ ajụjụ ndị a: Olee otú i nwere ike isi jiri vidio a nyere mmadụ aka ma gị na ya mụwa broshọ Ozi Ọma? (mwb19.03 7) Olee ihe ndị e kwuru na vidio a na-enyere gị aka ịkụzi ihe nke ọma? Gwa mmadụ niile na ha mepee broshọ a n’ekwentị ha ma ọ bụ na kọmputa ha, ha ga-ahụ vidio ndị a.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 108
Okwu Mmechi (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Abụ nke 107 na Ekpere