Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 25-26

Isọ Rere Ọnọdụ Ya Dị Ka Diọkpara

Isọ Rere Ọnọdụ Ya Dị Ka Diọkpara

25:27-34

Isọ ‘ejighị ihe dị nsọ kpọrọ ihe.’ (Hib. 12:16) N’ihi ya, o rere ọnọdụ ya dị ka diọkpara. Ọ lụkwara ụmụ nwaanyị abụọ na-ekpere arụsị.—Jen. 26:34, 35.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee otú m ga-esi egosi na m ji ihe ndị a na-esonụ kpọrọ ihe?’

  • Adịm ná mma mụ na Jehova

  • Mmụọ nsọ

  • Ịza aha Jehova

  • Ozi ọma

  • Ọmụmụ ihe

  • Alụmdi na nwunye