Mach 30–Eprel 5
JENESIS 29-30
Abụ nke 93 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Jekọb Alụọ Nwaanyị”: (Nkeji 10)
Jen. 29:18-20—Jekọb kwetara ijere Leban ozi ruo afọ asaa maka Rechel (w03 10/15 29 ¶6)
Jen. 29:21-26—Leban ghọrọ Jekọb aghụghọ ma kpọnye ya Lia n’ọnọdụ Rechel (w07 10/1 8-9; it-2 341 ¶3)
Jen. 29:27, 28—Jekọb tinyeere ụwa ya obiọma mgbe ihe siiri ya ike
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
Jen. 30:3—Gịnị mere Rechel ji were ụmụ Bilha mụtaara Jekọb ka ụmụ ya? (it-1 50)
Jen. 30:14, 15—Gịnị ka ọ ga-abụ ya mere Rechel ji were mkpụrụ mandrek gbanwere ohere o nwere ịmụta nwa? (w04 1/15 28 ¶7)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova Chineke, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jen. 30:1-21 (th ihe ọmụmụ nke 2)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe: (Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio bụ́ Okwu Na-agba Ume Ma Na-aba Uru, tụleekwanụ ihe ọmụmụ nke 16 na broshọ Izi Ihe.
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 5 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) bhs 59 ¶21-22 (th ihe ọmụmụ nke 18)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Izi Ndị Ìsì Ozi Ọma”: (Nkeji 10) Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya. Jụọ ajụjụ ndị a: Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị nyere ndị ìsì aka? Olee ebe anyị nwere ike ịhụ ndị ìsì? Gịnị ka anyị ga-eme iji gosi na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi? Olee ihe ndị anyị nwere ike iji nyere ha aka ịbịaru Jehova nso?
Ihe Nzukọ Jehova Na-eme: (Nkeji 5) Kpọnye vidio Ihe Nzukọ Jehova Na-eme nke ọnwa Mach.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 110
Okwu Mmechi (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Abụ nke 30 na Ekpere