Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 29-30

Jekọb Alụọ Nwaanyị

Jekọb Alụọ Nwaanyị

29:18-28

Jekọb amaghị nsogbu ndị ga-abịara ya n’ihi ịlụ nwaanyị. Rechel na Lia malitere ịma aka. (Jen. 29:32; 30:1, 8) N’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara Jekọb, ọ ma na Jehova nọnyeere ya. (Jen. 30:29, 30, 43) Mgbe e mechara, ụmụ ya ghọrọ mba Izrel.—Rut 4:11.

N’oge anyị a, ndị kpebiri ịlụ di ma ọ bụ nwunye ga-enwe mkpagbu. (1 Kọr. 7:28) N’agbanyeghị nke ahụ, alụmdi na nwunye ha ka nwere ike ịga nke ọma, ha enweekwa obi ụtọ ma ha tụkwasị Jehova obi ma mee ihe ndị e kwuru na Baịbụl.—Ilu 3:5, 6; Efe. 5:33.