Mach 9-15
JENESIS 24
Abụ nke 132 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“A Lụtaara Aịzik Nwaanyị”: (Nkeji 10)
Jen. 24:2-4—Ebreham zipụrụ onye na-ejere ya ozi ka ọ gaa chọtara Aịzik nwunye n’etiti ndị na-efe Jehova (wp16.3 14 ¶3)
Jen. 24:11-15—Onye na-ejere Ebreham ozi zutere Ribeka n’olulu mmiri (wp16.3 14 ¶4)
Jen. 24:58, 67—Ribeka kwetara ịlụ Aịzik (wp16.3 14 ¶6-7)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
Jen. 24:19, 20—Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Ribeka mere n’amaokwu a? (wp16.3 12-13)
Jen. 24:65—Gịnị mere Ribeka ji were ákwà isi kpuchie onwe ya, gịnịkwa ka ọ na-akụziri anyị? (wp16.3 15 ¶3)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova Chineke, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jen. 24:1-21 (th ihe ọmụmụ nke 2)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Vidio Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 4) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio ahụ ma jụọ ajụjụ ndị a: Olee otú onye nkwusa ahụ si jiri ajụjụ kụzie ihe nke ọma? Gịnị ka o kwuru mgbe onye nwe ụlọ gwara ya onye o chere Jizọs bụ?
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jiri ihe dị na peeji nke mbụ mee ya. (th ihe ọmụmụ nke 1)
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Zie ya ozi ọma n’agbanyeghị na o kwuru ihe gosiri na ọ chọghị ịnụ ozi ọma. (th ihe ọmụmụ nke 12)
Ịkpọ Ndị Mmadụ Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Onye nwe ụlọ nwere mmasị. Gwa ya gbasara vidio bụ́ Na-echeta Ọnwụ Jizọs. Mee ka ị̀ kpọnyeere ya vidio ahụ, unu emeekwa ozugbo ka ùnu elechaala ya. Kwurịtazienụ ihe dị na ya. (th ihe ọmụmụ nke 11)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
A Ga-ebido Ịkpọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs na Satọdee, Mach 14: (Nkeji 8) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Nye onye ọ bụla otu akwụkwọ ịkpọ òkù, kwurịtakwanụ ihe dị na ya. Kpọnye vidio gosiri otú a ga-esi kpọọ ndị mmadụ òkù, kwurịtakwanụ ihe unu mụtara na ya. Kwuzie nhazi e mere maka ịrụzu ókèala unu.
“Olee Ndị M Ga-akpọ?”: (Nkeji 7) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 107
Okwu Mmechi (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Abụ nke 9 na Ekpere