Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Olee Ndị M Ga-akpọ?

Olee Ndị M Ga-akpọ?

Kwa afọ, anyị na-agba mbọ pụrụ iche akpọ ndị nọ n’ókèala anyị ka ha soro anyị cheta ọnwụ Jizọs. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị anyị na-amaghị. Ma, anyị kwesịkwara ịkpọ ndị anyị ma. Ndị natara akwụkwọ ịkpọ òkù n’aka ndị ha maara na-abịakarị. (yb15 58 ¶1-4) Olee ndị i nwere ike ịkpọ ka ha bịa?

  • Ndị ikwu gị

  • Ndị ọrụ ibe gị ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe gị

  • Ndị agbata obi gị

  • Ndị nletaghachi gị na ndị ị na-amụrụ Baịbụl ma ugbu a ma n’oge gara aga

Ndị okenye ga-akpọkwa ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma ka ha bịa. Ọ bụrụkwanụ na e nwere onye ị ma na-ebighị nso n’ebe i bi? I nwere ike ịchọpụta ebe dị ya nso a ga-eme ya na oge a ga-eme ya. Ị ga-ahụ ya ma ị gaa na jw.org n’ebe e dere GBASARA ANYỊ, pịa “Ncheta Ọnwụ Jizọs.” Ka ị na-akwadebe maka Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ a, chee banyere ndị i nwere ike ịkpọ ka ha bịa, kpọọkwa ha.