Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA | MEE KA OZI ỌMA NA-ATỌKWU GỊ ỤTỌ

Jiri Okwu Chineke Na-akụzi Ihe

Jiri Okwu Chineke Na-akụzi Ihe

Okwu Chineke na-akpa ike. (Hib. 4:12) O nwedịrị ike iru ndị na-ekweghị na Chineke n’obi. (1 Tesa. 1:9; 2:13) Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ ma anyị nyere mmadụ aka, ya aghọta ihe ọhụrụ ọ na-amabughị na Baịbụl.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-ENWE ỌṄỤ A NA-ENWE N’IHI IME NDỊ NA-ESO ỤZỌ—NA-EME KA OTÚ I SI EZI OZI ỌMA KA MMA—NA-EME KA OKWU CHINEKE NA-AKPA IKE N’AHỤ́ NDỊ Ị NA-EZI OZI ỌMA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú Linda si mee ka Okwu Chineke kpaa ike n’ahụ́ Joy mgbe o nyeere ya aka ịhụ ihe mere o ji dị mma ịchọpụta ihe Okwu Chineke kwuru?

  • Olee otú Linda si mee ka Okwu Chineke kpaa ike n’ahụ́ Joy mgbe ọ gwara ya gụpụta amaokwu Baịbụl, meekwa ka ihe mere e ji gụọ ebe ahụ doo ya anya?

  • Olee ihe gosiri na amaokwu Baịbụl ahụ ruru Joy n’obi, oleekwa otú i chere obi dị Linda maka ya?