MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA | MEE KA OZI ỌMA NA-ATỌKWU GỊ ỤTỌ
Na-ajụ Ajụjụ
Jehova “Chineke bụ́ onye obi ụtọ” chọrọ ka obi na-atọ anyị ụtọ n’ozi ya. (1 Tim. 1:11) Obi ga na-atọkwu anyị ụtọ n’ozi anyị ma anyị na-emekwu nke ọma n’ozi ọma. Ịjụ ajụjụ nwere ike ime ka ndị anyị na-agwa okwu nwee mmasị ige anyị ntị, ọ bụkwa ụzọ dị mma isi malite mkparịta ụka. Ajụjụ nwere ike ime ka ndị mmadụ chebara ihe anyị na-agwa ha echiche. (Mat. 22:41-45) Ọ bụrụ na anyị ajụọ ajụjụ ma gee ntị ka onye anyị jụrụ ajụjụ na-azaghachi, ọ ga-eme ka onye ahụ mata na anyị ji ya kpọrọ ihe. (Jems 1:19) Ihe onye ahụ zara nwere ike inyere anyị aka ịma ihe anyị ga-ekwu iji ruo ya n’obi.
LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-ENWE ỌṄỤ A NA-ENWE N’IHI IME NDỊ NA-ESO ỤZỌ—NA-EME KA OTÚ I SI EZI OZI ỌMA KA MMA—NA-AJỤ AJỤJỤ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Olee àgwà ọma ndị Joy kpara?
-
Olee otú Linda si jiri ajụjụ gosi na o nwere mmasị n’ebe Joy nọ?
-
Olee otú Linda si jiri ajụjụ mee ka Joy nwekwuo mmasị n’ozi ọma?
-
Olee otú Linda si jiri ajụjụ nyere Joy aka ichebara ihe ọ na-agwa ya echiche?