OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Eṅomila Ndị Na-eguzosighị Ike n’Ihe
Kora, Detan, na Abaịram gosiri na ha eguzosighị ike n’ihe mgbe ha nupụụrụ Jehova isi. Jehova bibiri ha na ndị òtù ha. (Ọnụ Ọgụ. 16:26, 27, 31-33) Olee ọnọdụ ndị nwere ike ime ka a mata ma ànyị na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ? Olee ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ga-enyere anyị aka izere iṅomi ndị na-eguzosighị ike n’ebe Jehova nọ?
LEENỤ VIDIO BỤ́ EṄOMILA NDỊ NA-EGUZOSIGHỊ IKE N’IHE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Olee ihe mere ka a mata ma Nadia ọ̀ na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ, oleekwa akụkọ Baịbụl nyeere ya aka?
-
Olee ihe mere ka a mata ma otu nwanna ihe ndị okenye kpebiri na-adịghị mma ọ̀ na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ, oleekwa akụkọ Baịbụl nyeere ya aka?
-
Olee ihe mere ka a mata ma Terrance ọ̀ na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ, oleekwa akụkọ Baịbụl nyeere ya aka?
-
Olee ihe mere ka a mata ma otu nwanna nwoke nọ n’ụlọ akwụkwọ ọ̀ na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ, oleekwa akụkọ Baịbụl nyeere ya aka?