AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Kpachara Anya Maka Mpako na Ịtụkwasịkarị Onwe Gị Obi
Kora gbara ndokwa Jehova mere ụkwụ n’ihi na ọ dị mpako ma na-atụkwasị onwe ya obi (Ọnụ Ọgụ. 16:1-3; w11 9/15 27 ¶12)
Kora bụ onye Livaị a na-asọpụrụ n’Izrel, o nwekwara ọtụtụ ihe ùgwù (Ọnụ Ọgụ. 16:8-10; w11 9/15 27 ¶11)
Echiche na-adịghị mma Kora nwere kpataara ya ọtụtụ nsogbu (Ọnụ Ọgụ. 16:32, 35)
Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ndị anyị merela n’ozi Jehova mee ka anyị dịwa mpako ma ọ bụ na-atụkwasịkarị onwe anyị obi. Ka anyị na-anọkwu ogologo oge n’ọgbakọ, na-enwetakwa ọtụtụ ihe ùgwù, anyị kwesịrị ịna-adịkwu umeala n’obi.