Mach 8-14
ỌNỤ ỌGỤGỤ 9-10
Abụ nke 31 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Otú Jehova Si Edu Ndị Ya”: (Nkeji 10)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
Ọnụ Ọgụ. 9:13—Gịnị ka Ndị Kraịst nwere ike ịmụta n’ihe a gwara ụmụ Izrel n’amaokwu a? (it-1 199 ¶3)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova Chineke, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4) Ọnụ Ọgụ. 10:17-36 (th ihe ọmụmụ nke 5)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Ịkpọ Ndị Mmadụ Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Nkeji 3) Buru ụzọ mee ihe dị n’ebe e dere Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta. Onye nwe ụlọ gosichaa na o nwere mmasị, gwa ya gbasara vidio bụ́ Na-echeta Ọnwụ Jizọs. Mee ka ị̀ kpọnyeere ya vidio ahụ, unu emeekwa ozugbo ka ùnu elechaala ya. Kwurịtazienụ ihe dị na ya. (th ihe ọmụmụ nke 11)
Nletaghachi: (Nkeji 3) Kpọọ onye gị na ya na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ nwa akwụkwọ ibe gị i ziri ozi ọma n’oge gara aga ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. (th ihe ọmụmụ nke 2)
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 5) bhs peeji nke 214, ihe nke 16 e dere ná ngwụcha akwụkwọ ahụ—Kpọọ onye ị na-amụrụ Baịbụl ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, jirikwa Baịbụl kọwaara ya ihe mere na o kwesịghị ịta achịcha na ịṅụ mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs. (th ihe ọmụmụ nke 17)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Mgbanwe Ndị E Mere na Betel nke Mere Ka Ozi Ọma Na-agakwu n’Ihu: (Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio ahụ. Jụọ ụmụnna ajụjụ ndị a: Olee ọkwa a mara ná nnọkọ a na-enwe kwa afọ nke afọ 2015, oleekwa ihe abụọ mere e ji mee mgbanwe ndị e mere? Olee mgbanwe ndị e mere na Betel, oleekwa otú ha si baa uru? Olee otú ọkwa ahụ si metụta alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ a na-arụ na Briten? Olee otú mgbanwe ndị a si gosi na Jehova na-edu ndị ya?
Ihe Mere Anyị Ji Bịa Betel: (Nkeji 5) Kpọnye vidio ahụ.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) bt isi nke 6 ¶1-8 na igbe dị na peeji nke 44
Okwu Mmechi (Nkeji 3)
Abụ nke 12 na Ekpere