Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Nsogbu Ọ Bụla Nwere Ụbọchị Ọ Ga-ebi

Nsogbu Ọ Bụla Nwere Ụbọchị Ọ Ga-ebi

Nsogbu nwere ike ime ka anyị daa mbà n’obi, karịchaa ma ọ nọtee aka. Devid maara na nsogbu Eze Sọl na-enye ya ga-emecha kwụsị nakwa na ya ga-abụ eze otú Jehova kwere ya ná nkwa. (1 Sam. 16:13) Okwukwe Devid mere ka o nwee ndidi ma chere Jehova.

Anyị nọrọ ná nsogbu, anyị nwere ike iji akọ na amamihe mee ihe ga-enyere anyị aka ịpụta ná nsogbu ahụ. (1 Sam. 21:​12-14; Ilu 1:4) Ma, nsogbu ụfọdụ ka nwere ike ịdịgide n’agbanyeghị na anyị esila n’ụzọ niile Baịbụl kwadoro mee ihe niile anyị nwere ike ime banyere ha. Ọ́ dị otú ahụ, anyị kwesịrị inwe ndidi ma chere Jehova. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-akwụsị ahụhụ niile anyị na-ata, ‘hichapụkwa anya mmiri niile’ dị anyị n’anya. (Mkpu. 21:4) Ma nsogbu anyị ọ̀ kwụsịrị n’ihi na Jehova nyeere anyị aka ma ọ bụ n’ihi ihe ọ bụla ọzọ, otu ihe doro anya bụ: Nsogbu ọ bụla nwere ụbọchị ọ ga-ebi. Icheta ihe a ga-akasi anyị obi ma nsogbu bịara anyị.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NDỊ JEHOVA DỊ N’OTU N’ỤWA A ỌTỤTỤ NDỊ NA-ADỊGHỊ N’OTU, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee nsogbu bịaara ụfọdụ Ndị Kraịst bi n’ebe ndịda Amerịka?

  • Olee otú ha si gosi na ha nwere ndidi na ịhụnanya?

  • Olee otú ha si nọgide na-elekwasị anya ‘n’ihe ndị ka mkpa’?​—Fil. 1:10