Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA | MEE KA OZI ỌMA NA-ATỌKWU GỊ ỤTỌ

Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka ḷbụ Ndị Enyi Jehova

Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka ḷbụ Ndị Enyi Jehova

Jehova chọrọ ka anyị na-efe ya maka na anyị hụrụ ya n’anya. (Mat. 22:​37, 38) Ndị anyị na-amụrụ Baịbụl hụ Chineke n’anya, ha ga-enwe ike ịgbanwe ndụ ha, nweekwa ike imeri ọnwụnwa ndị ga-abịara ha. (1 Jọn 5:3) Ọ bụ ịhụ Chineke n’anya ga-eme ka ha chọọ ime baptizim.

Nyere ndị ị na-amụrụ Baịbụl aka ka ha mata na Chineke hụrụ ha n’anya. Jụọ ha ajụjụ ndị dị ka: “Gịnị ka ihe a na-akụziri gị banyere Jehova?” ma ọ bụ “Olee otú ihe a si egosi na Chineke hụrụ gị n’anya?” Nyere ha aka ịchọpụta ihe ndị gosiri na Jehova na-enyere ha aka. (2 Ihe 16:9) Kọọrọ ha oge ndị ị rịọrọ Jehova arịrịọ, ya emeere gị kpọmkwem ihe ị rịọrọ ya, gbaakwa ha ume ịna-achọpụta otú Jehova si na-aza ekpere ha. Anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ ma ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ghọta na Jehova hụrụ ha n’anya ma na-egosi na hanwa hụkwara ya n’anya ma chọọ ịbụ enyi ya.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NYERE NDỊ Ị NA-AMỤRỤ BAỊBỤL AKA ỊBỤ NDỊ ENYI JEHOVA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee nsogbu bịaara Joy?

  • Olee otú Linda si nyere Joy aka?

  • Olee otú Joy si merie nsogbu ahụ?