Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ole Ndị Bụ Ndị Enyi Gị n’Ịntanet?

Ole Ndị Bụ Ndị Enyi Gị n’Ịntanet?

Mmadụ na ibe ya na-abụ enyi ma ọ bụrụ na ihe ha na-amasị ibe ha, ha ana-akwanyekwara ibe ha ùgwù. Dị ka ihe atụ, mgbe Devid gbuchara Golayat, ya na Jonatan bịara bụrụ ezigbo enyi. (1 Sam. 18:1) Onye nke ọ bụla nwere àgwà ndị masịrị ibe ya mere ka ha bụrụ enyi. N’ihi ya, tupu mmadụ na ibe ya abụrụ ezigbo enyi, ha ga-amarịrị onwe ha nke ọma. Ịmatakwanụ mmadụ nke ọma adịghị mfe. Ma a bịa n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet, mmadụ nwere ike imeta onye ọzọ enyi naanị ma ọ pịa aka otu ebe n’Ịntanet. Ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịhazi ihe ha ga-ekwu nke ọma n’Ịntanet otú ọ ga-amasị ndị ọzọ. Ha na-ekwukwa ihe ndị ga-eme ka a na-ele ha anya ọma. Ihe ndị a na-eme ka ọ dịrị ha mfe izochi ụdị ndị ha bụ n’eziokwu. N’ihi ya, ọ dị mma ka mmadụ kpebie ụdị ndị ọ ga-emeta enyi n’Ịntanet. Onye ị na-amaghị zitere gị ozi ka gị na ya bụrụ enyi, ụjọ atụla gị ịsị ya mba ma ọ bụ ịgba ya nkịtị. A sịkwala na ị chọghị ime ihe ga-ewute ya. Ụfọdụ ndị ekpebiela na ha agaghị na-aga n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet n’ihi nsogbu ndị o nwere ike ịkpata. Ma, i kpebie ịga n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet, olee ihe ndị i kwesịrị iburu n’uche?

LEENỤ VIDIO BỤ́ KPACHARA ANYA N’EBE A NA-EMETA NDỊ ENYI N’ỊNTANET, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee ihe ndị i kwesịrị ichebara echiche tupu gị edenye ihe ma ọ bụ tinye foto n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet?

  • Gịnị mere o ji dị mkpa ịkpachara anya mgbe ị na-ahọrọ ndị gị na ha ga-abụ enyi n’Ịntanet?

  • Gịnị mere o ji dị mma inwe oge i kpebiri ị ga na-anọru n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet?​—Efe. 5:​15, 16