Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

David facing Goliath

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

“Ọ Bụ Jehova Nwe Agha A”

“Ọ Bụ Jehova Nwe Agha A”

Ihe ndị Devid ma banyere Jehova na ihe ndị Jehova meere ya mere ka o nwee okwukwe na Jehova (1 Sam. 17:​36, 37; wp16.5 11 ¶2-3)

Devid ejighị onwe ya tụnyere Golayat, kama o ji Golayat tụnyere Jehova (1 Sam. 17:​45-47; wp16.5 11-12)

Jehova mere ka Devid merie onye iro ya siri ajọ ike (1 Sam. 17:​48-50; wp16.5 12 ¶4; lee foto dị n’ihu akwụkwọ a)

Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike inwe nsogbu ndị siri ezigbo ike, dị ka mkpagbu ma ọ bụ àgwà ọjọọ ririla anyị ahụ́. Ọ bụrụ na ọ dị anyị ka nsogbu anyị ọ̀ karịala anyị, ka anyị cheta na o nweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere Jehova.​—Job 42:​1, 2.