Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ihe Atọ Ndị Ga-enyere Gị Aka Ịtụkwasị Jehova Obi

Ihe Atọ Ndị Ga-enyere Gị Aka Ịtụkwasị Jehova Obi

Devid meriri Golayat n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi. (1 Sam. 17:45) Jehova chọrọ igosi ike ya maka ndị ohu ya niile. (2 Ihe 16:9) Gịnị ga-enyere anyị aka ịtụkwasị Jehova obi kama ịtụkwasị obi n’ihe ndị anyị merela na mbụ nakwa na nkà ndị anyị nwere? Lee ihe atọ ga-enyere anyị aka:

  • Na-ekpe ekpere mgbe niile. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka imeri ọnwụnwa, ọ bụghị naanị ịrịọ ya ka ọ gbaghara gị mgbe i mejọchara. (Mat. 6:​12, 13) Rịọ Jehova ka o nyere gị aka tupu gị emee mkpebi, ọ bụghị naanị ịrịọ ya ka ọ gọzie mkpebi ndị i merela eme.​—Jems 1:5

  • Na-agụchi Baịbụl anya, na-amụchikwa ya anya. Na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. (Ọma 1:2) Na-echebara ndị ị gụrụ gbasara ha echiche, na-emekwa ihe ndị ị mụtara n’akụkọ ha. (Jems 1:​23-25) Kwadebe nke ọma tupu gị agawa ozi ọma kama ịtụkwasị obi n’ihe ndị i merela n’oge gara aga. Na-akwadebekwa ọmụmụ ihe. Ọ ga-eme ka i rite ezigbo uru na ya

  • Na-erube isi n’ihe ọ bụla nzukọ Jehova kwuru. Mata ntụziaka ndị kacha ọhụrụ nzukọ Jehova nyere, meekwa ha ozugbo. (Ọnụ Ọgụ. 9:17) Ndị okenye nye ntụziaka ma ọ bụ ndụmọdụ, gee ha ntị.​—Hib. 13:17

LEENỤ VIDIO BỤ́ O NWEGHỊ IHE KWESỊRỊ IME KA ANYỊ TỤỌ EGWU MKPAGBU, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

• Olee ihe ndị tụrụ ụmụnna ụjọ?

• Olee ihe ndị nyeere ha aka?