Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ịgụ Baịbụl Kwa Ụbọchị na Ịchọ Amamihe

Ịgụ Baịbụl Kwa Ụbọchị na Ịchọ Amamihe

Amamihe nke si n’aka Chineke bara uru ka akụ̀ zoro ezo. (Ilu 2:1-6) Amamihe na-enyere anyị aka ka anyị na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị ma na-eme mkpebi ndị dị mma. Ọ na-echebe anyị ma na-azọ anyị ndụ. N’ihi ya, “amamihe bụ ihe kacha mkpa.” (Ilu 4:5-7) Anyị ga-agbarịrị mbọ tupu anyị egwupụta ọmarịcha akụ̀ ndị zoro ezo dị n’Okwu Chineke. Otú anyị nwere ike isi malite bụ ịna-agụ Baịbụl “ehihie na abalị,” ya bụ, kwa ụbọchị. (Josh. 1:8) Lee aro ụfọdụ a tụrụ ga-enyere anyị aka ịna-agụchi Baịbụl anya, ya ana-atọkwa anyị ụtọ.

LEENỤ VIDIO BỤ́ ỤMỤ OKORO NA AGBỌGHỌ NDỊ NA-AMỤTA ỊHỤ OKWU CHINEKE N’ANYA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

Olee ihe ndị mere ka o siere ndị a na-eto eto ike ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, oleekwa ihe ndị nyeere ha aka?

  • Melanie

  • Samuel

  • Celine

  • Raphaello

OTÚ M HAZIRI M GA-ESI NA-AGỤ BAỊBỤL: