Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ka Mkpebi Ndị Ị Na-eme Gosi na Ị Tụkwasịrị Jehova Obi

Ka Mkpebi Ndị Ị Na-eme Gosi na Ị Tụkwasịrị Jehova Obi

Kwa ụbọchị, a na-enwe ọtụtụ mkpebi ndị anyị ga-emerịrị. Ọtụtụ ndị n’ụwa na-agbakwasịkarị ụkwụ n’otú obi dị ha ma ọ bụ n’ihe ha hụrụ ọtụtụ ndị na-eme ekpebi ihe hanwa ga-eme. (Ọpụ. 23:2; Ilu 28:26) Ma, ndị tụkwasịrị Jehova obi na-ebu ụzọ “chọpụta ihe bụ́ uche ya” tupu ha emewe mkpebi. Otú ha si eme ya bụ ikwe ka Baịbụl duzie ha ma ha kpebiwe ihe ha chọrọ ime.—Ilu 3:5, 6.

N’okpuru amaokwu nke ọ bụla e dere ebe a, dee ihe amaokwu ahụ ga-enyere gị aka ime mkpebi dị mma na ya.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-EME KA NDỊ NWERE OKWUKWE, Ọ BỤGHỊ NDỊ NA-ENWEGHỊ OKWUKWE—NA-EME KA MOSIS, Ọ BỤGHỊ FERO, ZAAKWANỤ AJỤJỤ A:

Olee otú onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl si nyere nwanna nwoke ahụ aka ime mkpebi dị mma?