Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mach 20-26

2 IHE E MERE 1-4

Mach 20-26

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

  • Ịkpọ Ndị Mmadụ Òkù Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Nkeji 3) Kpọọ onye gị na ya na-arụkọ ọrụ, nwa akwụkwọ ibe gị, ma ọ bụ onye ikwu gị ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. (th ihe ọmụmụ nke 2)

  • Nletaghachi: (Nkeji 4) Gaara onye nwere mmasị natara akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs nletaghachi. Gwa ya na anyị na ya nwere ike ịmụwa Baịbụl n’anaghị ya ego, nyekwa ya broshọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Gosi ya vidio bụ́ Olee Otú Anyị na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl? Mee ka ị̀ kpọnyeere ya vidio ahụ, unu emeekwa ozugbo ka ùnu elechaala ya. Kwurịtazienụ ihe dị na ya. (th ihe ọmụmụ nke 17)

  • Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 5) lff isi nke 09 nọmba nke 5 (th ihe ọmụmụ nke 9)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

  • Abụ nke 19

  • Ị̀ Ga-adị Njikere Maka Ụbọchị Kacha Mkpa n’Afọ?: (Nkeji 15) Okwu. A ga-elekwa vidio. Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya. Kwuo otú òkù a na-akpọ ndị mmadụ n’ókèala unu ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs si na-aga. Gbaa ndị nwere ihe ọma ha ga-akọ mere mgbe ha na-akpọ ndị mmadụ òkù ajụjụ ọnụ. Chetara ụmụnna usoro ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs nke dị na peeji nke 8 na nke 9 n’akwụkwọ a, gbaakwa mmadụ niile ume ka ha kwadebe obi ha. (Ezra 7:10) Kwuo otú anyị nwere ike isi jiri obi anyị niile nabata ndị anyị kpọrọ òkù ma ha bịa n’abalị ahụ a ga-echeta ọnwụ Jizọs. (Rom 15:7; mwb16.03 2) Kpọnye vidio bụ́ Otú E Si Akwadebe Achịcha Ememme Ncheta.

  • Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) lff isi nke 41 nọmba nke 1-4

  • Okwu Mmechi (Nkeji 3)

  • Abụ nke 135 na Ekpere