Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Eze Solomọn Kpebiri Ime Ihe Na-adịghị Mma

Eze Solomọn Kpebiri Ime Ihe Na-adịghị Mma

[Kpọnye vidio Ihe Akwụkwọ 2 Ihe E Mere Na-ekwu.]

Solomọn si n’Ijipt na-enweta ọtụtụ ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya (Diut. 17:15, 16; 2 Ihe 1:14, 17)

A rụrụ ọtụtụ obodo, kpọtakwa ọtụtụ ndị ga na-elekọta ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya ndị ahụ sozi n’ihe ndị e ji alụ agha Solomọn nwere (2 Ihe 1:14; it-1 174 ¶5; 427)

Ọ bụ eziokwu na ihe gaziiri ndị Izrel n’oge Solomọn na-achị, ma ha nupụụrụ Eze Rehoboam isi n’ihi na o wepụghị ibu arọ nna ya boro ha, kama ọ tụkwasịdịrị ihe na ya. (2 Ihe 10:3, 4, 14, 16) Ihe ọ bụla anyị kpebiri ime nwere ike ịbara anyị uru ma ọ bụ ghọ anyị ahịa.—Gal. 6:7.