AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Obi M Ga-adịkwa na Ya Mgbe Niile”
Jehova họọrọ ụlọ nsọ Solomọn rụrụ ka ọ bụrụ nke ya (2 Ihe 7:11, 12)
Obi Jehova ga na-adị na ya mgbe niile. Ihe a gosiri na ọ ga na-enwe ezigbo mmasị n’ihe a na-eme n’ụlọ a a ga-anọ na-eto aha ya (2 Ihe 7:16; w02 11/15 5 ¶1)
Ọ bụrụ na ndị Izrel akwụsị iji “obi ha niile” na-efe Jehova, ọ ga-ekwe ka e bibie ụlọ nsọ ahụ (2 Ihe 6:14; 7:19-21; it-2 1077-1078)
Mgbe a na-enyefe Jehova ụlọ nsọ ahụ, ndị Izrel chere na o nweghị mgbe ha ga-akwụsị iji obi ha niile na-efe Jehova n’ebe ahụ. Ma, ọ dị mwute na ofufe Jehova ji nwayọọ nwayọọ gbụ ha.
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee otú m si egosi na obi m niile dị n’ofufe m na-efe Jehova?’