Mach 6-12
1 IHE E MERE 23-26
Abụ nke 123 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“A Haziri Otú E Si Efe Chineke n’Ụlọ Nsọ Nke Ọma”: (Nkeji 10)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
1 Ihe 25:7, 8—Gịnị ka amaokwu ndị a na-egosi gbasara otú ịbụrụ Jehova abụ otuto dịruru ná mkpa? (w22.03 22 ¶10)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4) 1 Ihe 23:21-32 (th ihe ọmụmụ nke 5)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Vidio E Ji Akpọ Ndị Mmadụ Òkù Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Nkeji 5) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio bụ́ Ịkpọ Ndị Mmadụ Òkù Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Mgbe ọ bụla ajụjụ pụtara na vidio ahụ, kwụsịtụ ya ma jụọ ụmụnna ajụjụ ndị ahụ. Ha zachaa, a kpọnyekwa ya.
Ịkpọ Ndị Mmadụ Òkù Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Nkeji 3) Jiri isiokwu a na-ekwu gbasara ya n’Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta malite. Onye nwe ụlọ gosichaa mmasị, gosi ya vidio bụ́ Na-echeta Ọnwụ Jizọs. Mee ka ị̀ kpọnyeere ya vidio ahụ, unu emeekwa ozugbo ka ùnu elechaala ya. Kwurịtazienụ ihe dị na ya. (th ihe ọmụmụ nke 11)
Okwu: (Nkeji 5) w11 6/1 14-15—Isiokwu: Gịnị Mere E Ji Hazie Ndị Kraịst Ahazi? (th ihe ọmụmụ nke 14)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Otú Anyị Ga-esi Nyere Ụmụnna Anyị Aka ma E Nwee Ọdachi”: (Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-elekwa vidio.
A Ga-ebido Ịkpọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs na Satọdee, Mach 11: (Nkeji 5) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri obere oge kwuo ihe dị n’akwụkwọ ịkpọ òkù. Kwuzie nhazi ọgbakọ unu mere maka okwu ihu ọha pụrụ iche, Ncheta Ọnwụ Jizọs, na ịrụzu ókèala unu.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) lff isi nke 39 na ihe nke 3 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a
Okwu Mmechi (Nkeji 3)
Abụ nke 127 na Ekpere