OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Otú Anyị Ga-esi Nyere Ụmụnna Anyị Aka ma E Nwee Ọdachi
Ọdachi ndị na-emere onwe ha na-emekarịzi n’oge anyị a. Ọ bụrụ na e nwee ọdachi, e kwesịrị ịhazi ihe ndị a na-eme iji gbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka nke ọma. Ọ bụ ya mere Òtù Na-achị Isi ji mee ndokwa ka e nwee Ngalaba Na-ahụ Maka Ịgbatara Ndị Ọdachi Dakwasịrị Ọsọ Enyemaka n’alaka ụlọ ọrụ anyị ọ bụla.
Ọ bụrụ na ụmụnna nọ na ngalaba a anụ na e nwere ọdachi, ha na-akpọtụrụ ndị okenye ọgbakọ ebe ahụ ka ha chọpụta ihe e kwesịrị imere ndị nkwusa nọ n’ebe ahụ. Ọ bụrụ na nsogbu ọdachi ahụ kpatara karịrị ndị nkwusa ahụ aka, alaka ụlọ ọrụ ga-edunye ụmụnna ruru eru ka ha hụ na a gbataara ndị nkwusa ahụ ọsọ enyemaka. Ụmụnna ndị ahụ nwere ike ikwu ka ụmụnna ndị ọzọ bịa nye aka ma ọ bụ kwuo na e nwere ihe ndị a chọrọ ka ụmụnna nye n’onyinye, ma ọ bụkwanụ ha azụta ihe ndị dị mkpa kesaara ụmụnna ndị ọdachi dakwasịrị.
Ime ihe otú a nwere ọtụtụ uru ọ na-aba. Ọ na-eme ka onye ọ bụla mara ọrụ nke ya, ka ihe ndị e kwesịrị ime doo onye ọ bụla anya, nakwa ka a ghara imefusị ego na ihe ndị e ji arụ ọrụ, bụ́kwanụ ihe nwere ike ime ma ụmụnna jiri aka ha mewe ihe ha chọrọ ime.
Ụmụnna ndị alaka ụlọ ọrụ họpụtara nwere ike ikpebi ego ole a chọrọ iji gbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka nakwa ụmụnna ole ga-abịa nye aka. Ha nwekwara ike ịgbalị mata ndị isi obodo n’ebe ahụ e nwere ọdachi, bụ́ ndị nwere ike inye aka mee ka e kesaa ihe ndị anyị ji agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka ngwa ngwa. N’ihi ya, ọ bụrụ na a gwaghị mmadụ agwa, o kwesịghị ịnakọta ụmụnna ego, o kwesịghị izigara onye ọ bụla ihe e ji agbatara ụmụnna ọsọ enyemaka, o kwesịghịkwa ịga n’ebe ahụ e nwere ọdachi.
Ma e nwee ọdachi, anyị kwesịrị inye aka. (Hib. 13:16) Anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya. Gịnị ka anyị nwere ike ime iji nyere ha aka? Nke kachanụ bụ na anyị nwere ike ikpe ekpere maka ndị ahụ ọdachi dakwasịrị na ndị na-agbatara ha ọsọ enyemaka. Anyị nwekwara ike inye onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ. Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche, bụ́ ndị Òtù Na-achị Isi na-eduzi, ga-akacha ama ebe ego anyị na-enye n’onyinye ga-akacha aba uru. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ igosi na anyị dị njikere inye aka ma e nwee ọdachi, anyị ga-edejupụta fọm bụ́ Local Design/Construction Volunteer Application (DC-50).
LEENỤ VIDIO BỤ́ NNUKWU MMIRI OZUZO KPARA MKPAMKPA NA BRAZIL, ZAAKWANỤ AJỤJỤ A:
Gịnị masịrị gị n’otú Ndịàmà Jehova si gbatara ụmụnna ha ọsọ enyemaka mgbe nnukwu mmiri ozuzo kpachara mkpamkpa na Brazil n’afọ 2020?