Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Eprel 29–Mee 5

ABỤ ỌMA 34-35

Eprel 29–Mee 5

Abụ nke 10 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. “Na-eto Jehova Mgbe Niile”

(Nkeji 10)

Devid toro Jehova, ma mgbe ihe nọ na-esiri ya ike (Ọma 34:1; w07 3/1 22 ¶11)

Devid ejighị onwe ya nyaa isi, kama o ji Jehova nyaa isi (Ọma 34:2-4; w07 3/1 22 ¶13)

Otuto Devid toro Jehova mere ka okwukwe ndị enyi ya sie ike (Ọma 34:5; w07 3/1 23 ¶15)

Mgbe Jehova napụtachara Devid n’aka Abimelek, narị ụmụ nwoke anọ (400) ndị ihe Eze Sọl na-eme na-ewute sonyeere Devid. (1 Sam. 22:1, 2) Ọ ga-abụ ndị a ka Devid bu n’obi dee abụ ọma a.​—Ọma 34, okwu mmeghe ya.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee otú m ga-esi too Jehova mgbe m na-agwa mmadụ okwu n’oge ọzọ m bịara ọmụmụ ihe?’

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 35:19​—Gịnị ka Devid bu n’obi mgbe ọ rịọrọ Jehova ka ọ ghara ikwe ka ndị kpọrọ ya asị ‘rọọ ya anya’? (w06 5/15 20 ¶2)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Ụka gị na ya na-akparịta biri tupu gị enwee ike izi ya ozi ọma. (lmd isi nke 1 nọmba nke 4)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. (lmd isi nke 2 nọmba nke 4)

6. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere

(Nkeji 5) Ihe Ngosi. ijwfq 59​—Isiokwu: Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Amata Ememme Ha Nwere Ike Ime? (th ihe ọmụmụ nke 17)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 59

7. Ụzọ Atọ Anyị Nwere Ike Isi Too Jehova n’Ọmụmụ Ihe

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Oge anyị nọ n’ọmụmụ ihe bụ oge magburu onwe ya anyị ga-eji too Jehova. Lee ụzọ atọ anyị nwere ike isi mee ya.

Anyị na Ndị Ọzọ Ịkparịta Ụka: Gị na ndị ọzọ kparịtawa ụka, na-ekwu banyere ihe ọma ndị Jehova na-eme. (Ọma 145:1, 7) Ò nwere ihe ị nụrụ ma ọ bụ ihe ị gụrụ baara gị uru? Ò nwere ihe na-agba ume mere mgbe ị nọ n’ozi ọma? Ò nwere onye kwuru ma ọ bụ mee ihe gbara gị ume? Ò nwere ihe Jehova kere ị hụrụ masịrị gị? Ihe ndị a niile bụ onyinye si n’aka Jehova. (Jems 1:17) Gbalịa bịa ọmụmụ ihe nkeji ole na ole tupu a malite ka i nwee oge gị na ndị ọzọ ga-eji kparịta.

Ịza Ajụjụ: Gbalịa zaa, ọ dịkarịa ala, otu ajụjụ n’ọmụmụ ihe ọ bụla ị gara. (Ọma 26:12) I nwere ike ịza kpọmkwem ihe a jụrụ ma ọ bụkwanụ ọ bụrụ na a zaala ya, gị ekwuzie banyere ihe ọzọ bara uru dị na paragraf a na-amụ, amaokwu Baịbụl dị na ya, foto dị na ya, ma ọ bụkwanụ otú a ga-esi eme ihe ahụ a na-amụ. Ebe ọ bụ na ụmụnna ndị ọzọ nwere ike iwelikwa aka mgbe gịnwa weliri, kwadebe ọtụtụ azịza. Ọ bụrụ na anyị ejiri tịnkọm tịnkọm iri atọ ma ọ bụ ihe na-erughị ya zaa ajụjụ, ọ ga-eme ka ọtụtụ ndị nwee ohere ‘ịchụrụ Chineke àjà otuto.’​—Hib. 13:15.

Ịbụ Abụ: Jiri obi gị niile na-abụ abụ Alaeze n’ọmụmụ ihe. (Ọma 147:1) O nwere ike a gaghị akpọ gị ka ị zaa ajụjụ n’ọmụmụ ihe niile, karịchaa, n’ọgbakọ buru ibu. Ma, i nwere ike iso bụọ abụ niile. Ọ bụrụgodị na i chere na ị bụghị onye abụ, i jiri obi gị niile bụọ abụ, ọ ga-eme Jehova obi ụtọ. (2 Kọr. 8:12) I nwere ike ịmụ abụ ndị ahụ n’ụlọ iji kwadebe maka ịbụ ha n’ọmụmụ ihe.

Kpọnye VIDIO bụ́ Nzukọ Jehova Na-aga n’Ihu n’Ihu​—Abụ Bụ Onyinye, Agba nke Mbụ. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

Malite n’oge Ndị Mmụta Baịbụl, olee otú anyị sirila gosi na ịbụku Jehova abụ otuto dị ezigbo mkpa?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr isi nke 9 ¶1-9 na vidio kọwara isiokwu a na-amụ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ Ọhụrụ Maka Mgbakọ Ukwu Afọ 2024 na Ekpere