Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mach 4-⁠10

ABỤ ỌMA 16-17

Mach 4-⁠10

Abụ nke 111 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. “Jehova, Ihe Ọma Niile Na-emere M Si n’Aka Gị”

(Nkeji 10)

Anyị na-enwe obi ụtọ ma anyị na ndị na-efe Jehova bụrụ enyi (Ọma 16:2, 3; w18.12 26 ¶11)

Obi na-atọ anyị ụtọ ma anyị na Jehova bụrụ nnu na mmanụ (Ọma 16:5, 6; w14 2/15 29 ¶4)

Otú Jehova si echebe anyị ka ihe ọ bụla ghara imebi mmekọrịta anyị na ya na-eme ka obi ruo anyị ala (Ọma 16:8, 9; w08 2/15 3 ¶2-3)

Ndụ anyị na-enwe isi ka nke Devid maka na ihe kacha anyị mkpa bụ ife Jehova, Onye ihe ọma niile na-emere anyị si n’aka.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee otú ndụ m si ka mma ugbu a karịa mgbe m na-abụbeghị Onyeàmà Jehova?’

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 17:8​—Gịnị ka okwu a bụ́ “mkpụrụ anya gị” pụtara? (it-2 714)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(1 nkeji) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Nye ya akwụkwọ anyị ji akpọ ndị mmadụ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. (th ihe ọmụmụ nke 11)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Nye ya akwụkwọ anyị ji akpọ ndị mmadụ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Onye ahụ gosichaa na o nwere mmasị, gosi ya vidio bụ́ Na-echeta Ọnwụ Jizọs. (th ihe ọmụmụ nke 9)

6. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 2) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Nye ya akwụkwọ anyị ji akpọ ndị mmadụ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. (th ihe ọmụmụ nke 2)

7. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 20

8. Olee Otú Anyị Ga-esi Kwadebe Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Anyị chọrọ irube isi n’iwu Jizọs nyere. N’ihi ya, na Sọnde, Mach 24, anyị ga-echeta ọnwụ Jizọs. Ọnwụ ya mere ka anyị mata ụzọ abụọ kachanụ e si gosi anyị ịhụnanya. (Luk 22:19; Jọn 3:16; 15:13) Olee otú anyị ga-esi akwadebe maka ihe a pụrụ iche anyị ga-eme?

  • Jiri obi gị niile soro kpọọ ndị mmadụ ka ha bịa gere okwu ihu ọha pụrụ iche a ga-ekwu nakwa ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Dee aha ndị ị ma ị ga-achọ ịkpọ, kpọọkwa ha. Ọ bụrụ na e nwere ụfọdụ n’ime ha na-ebighị n’ókèala unu, gaa na jw.org ka ị mata oge na ebe a ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ebe ha bi

  • N’ọnwa Mach na Eprel, jirikwuo oge buru ibu kwusaa ozi ọma. Ị̀ ga-arụli ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, nye awa iri na ise ma ọ bụ iri atọ n’ọnwa ndị ahụ?

  • Na Mach 18, malite ịgụ ihe ndị dị mkpa mere n’izu ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa. Ọ bụ gị ga-ekpebi amaokwu ole ị ga-agụ kwa ụbọchị n’ime amaokwu niile e dere ‘n’Usoro Ọgụgụ Baịbụl Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs nke Afọ 2024’ nke dị na peeji nke 6-7

  • N’ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs, lee vidio Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị pụrụ iche na jw.org

  • Ị gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs, nabata ndị ọhụrụ na ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma bịaranụ. Mee ka ha mara na ọ bụrụ na ha nwere ajụjụ ha chọrọ ịjụ ma e mechaa, na ị dị njikere ịza ya. Mee ndokwa ịga na nke ndị bịaranụ ka i nyere ha aka ka ha mụtakwuo ihe.

  • Tupu e mee Ncheta Ọnwụ Jizọs nakwa mgbe e mechara ya, chebara ihe mgbapụta ahụ echiche

Kpọnye VIDIO bụ́ Na-echeta Ọnwụ Jizọs. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

Olee otú anyị ga-esi eji vidio a akpọ ndị mmadụ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr isi nke 7 ¶1-7 na vidio kọwara isiokwu a na-amụ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 73 na Ekpere