Ihe I Nwere Ike Ikwu
ỤLỌ NCHE
Ajụjụ: Ì chere na ihe e kwuru n’ebe a anyị ga-agụ na Baịbụl ugbu a ga-eme eme?
Amaokwu Baịbụl: Mkpu. 21:3, 4
Otú a ga-esi enye ya: Ụlọ Nche a kọwara otú Chineke ga-esi emezu nkwa ahụ o kwere nakwa otú nkwa ahụ ga-esi abara anyị uru.
ỤLỌ NCHE (peeji nke 16)
Ajụjụ: Legodị ajụjụ a dị́ ebe a. [Gụpụtara ya ajụjụ nke mbụ dị́ na peeji nke 16 na azịza ndị dị́ n’okpuru ya.] Gịnị ka i chere?
Amaokwu Baịbụl: Ọma 83:18
Otú a ga-esi enye ya: Isiokwu a ga-akọwakwuru gị ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru gbasara aha Chineke.
BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ
Ajụjụ: Ụfọdụ ndị na-eche na ọ bụ Chineke na-achị ụwa a. Ma, ì chere na ọ bụ onye ọzọ dị iche ka Baịbụl kwuru na-achị ụwa?
Amaokwu Baịbụl: 1 Jọn 5:19
Otú a ga-esi enye ya: Akwụkwọ a ga-eme ka ihe a amaokwu Baịbụl a kwuru dokwuo gị anya, ọ ga-akọwakwara gị gbasara ihe ndị ọzọ Baịbụl na-akụzi.
DEE OTÚ ỌZỌ Ị GA-ESI JIRI OTU N’IME AKWỤKWỌ NDỊ A ZIE OZI ỌMA
Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.