Ònye Ga-abụ Ọbịa n’Ụlọikwuu Jehova?
Ọ bụ onye bụ enyi Chineke ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu ya. Onye ahụ ga-atụkwasị ya obi, na-erubekwara ya isi. Abụ Ọma nke iri na ise kwuru ụdị onye Jehova ga-ekwe ka ọ bụrụ enyi ya.
ENYI JEHOVA GA . . .
-
na-eme ezi omume
-
na-ekwu eziokwu n’obi ya
-
na-akwanyere ụmụnna ya ùgwù
-
na-eme ihe o kwere ná nkwa a sịgodị na o mechara chọpụta na ọ ga-ebu ya aka
-
na-enyere ndị nọ ná mkpa aka, n’atụghị anya irite ihe ọ bụla n’aka ha
ENYI JEHOVA AGAGHI . . .
-
na-agba asịrị ma ọ bụ na-ekwutọ ndị ọzọ
-
na-eme mmadụ ibe ya ihe ọjọọ
-
na-aghọ ụmụnna ya aghụghọ
-
na-eso ndị na-enupụrụ Jehova isi ma ọ bụ ndị na-anaghị efe ya akpakọrịta
-
na-eri ngarị