OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Otú E Si Eji JW Library Eme Ihe
ỊMỤ IHE N’ONWE GỊ:
-
I nwere ike iji ya na-agụ Baịbụl na ihe mmụta dịịrị ụbọchị
-
Ọ ga-enyere gị aka ịna-agụ Akwụkwọ Mgbaafọ, magazin na akwụkwọ ndị ọzọ
-
Ọ ga-enyere gị aka ịna-akwadebe ọmụmụ ihe. Ọ ga-enyekwara gị aka ịkanye azịza gị ihe
-
I nwere ike iji ya lee vidio
N’ỌMỤMỤ IHE:
-
I nwere ike iji ya na-emepe amaokwu Baịbụl a na-agụ
-
JW Library ga-eme ka ị ghara ibu ọtụtụ akwụkwọ na-aga ọmụmụ ihe. I nwere ike isi na ya nweta ma akwụkwọ niile a ga-eji amụ ihe ma abụ. Abụ ọhụrụ niile a na-ebipụtabeghị dịcha na ya
N’OZI ỌMA:
-
I nwere ike igosi onye nwere mmasị i ziri ozi ọma ihe ndị dị́ na JW Library, gị enyekwara ya aka danloduo JW Library nke ya nakwa ihe ndị anyị nwere dị́ na ya
-
I nwere ike idenye ihe ụfọdụ amaokwu ị na-achọ kwuru ka o bupụtara gị amaokwu ahụ
-
Ọ bụrụ na onye ị gara izi ozi ọma nwere ụmụaka, i nwere ike igosi ha otu n’ime vidio Kelechi. I nwekwara ike igosi mmadụ vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? Ọ bụrụ na onye ị hụrụ n’ozi ọma anaghị anụ Igbo, i nwere ike isi na JW Library kpọnyere ya vidio dị́ n’asụsụ ya
-
I nwere ike iji ya gosi mmadụ amaokwu Baịbụl n’asụsụ ya ma ọ bụrụ na ị danloduru asụsụ ahụ. I mepee amaokwu ahụ, gị apịa nọmba amaokwu ahụ aka, ya ebupụtara gị ihe ndị e sere ese, gị apịzie nke e sere ihe yiri Baịbụl