Mee 9-15
ABỤ ỌMA 1-10
Abụ nke 99 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Ịkwanyere Jizọs Ùgwù Ga-eme Ka Anyị na Jehova Dị́ ná Mma”: (Nkeji 10)
[Kpọnye vidio bụ́ Ihe Akwụkwọ Abụ Ọma na-ekwu.]
Ọma 2:1-3—E buru amụma na o nwere ndị ga-akpọ Jehova na Jizọs asị (w04 7/15 16-17 ¶4-8; it-1 507; it-2 386 ¶3)
Ọma 2:8-12—Ọ bụ naanị ndị na-akwanyere Eze ahụ Jehova tere mmanụ ùgwù ga-adị ndụ (w04 8/1 5 ¶2-3)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Ọma 2:7—Gịnị bụ “ihe Jehova nyere n’iwu”? (w06 5/15 17 ¶6)
Ọma 3:2—Gịnị ka Sila pụtara? (w06 5/15 18 ¶2)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova??
Olee ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a nke ị ga-eji zie ndị mmadụ ozi ọma?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Ọma 8:1–9:10
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Ozi Ụlọ n’Ụlọ: (Nkeji 2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Isiokwu Ụlọ Nche Nke 3 2016. Si n’ekwentị gụọrọ onye nwe ụlọ otu amaokwu Baịbụl.
Nletaghachi: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Isiokwu Ụlọ Nche Nke 3 2016
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 6 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) bhs 11 ¶12-13. Gbaa onye ahụ ị na-amụrụ Baịbụl ume ka ọ danloduo JW Library nke ya.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Egwula Egwu n’Ụlọ Jehova: (Nkeji 5) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio bụ́ Bụrụ Enyi Jehova—Egwula Egwu n’Ụlọ Jehova.. (Gaa na jw.org/ig pịa IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI > pịa ỤMỤAKA.) E lechaa ya, kpọọ ụfọdụ ụmụaka ka ha gbagote n’ikpo okwu, gị ajụọ ha ajụjụ ụfọdụ gbasara vidio ahụ.
Otú Aha Chineke Si Gbaa n’Akwụkwọ Nsọ Hibru: (Nkeji 10) Okwu. Ọ ga-esi n’akwụkwọ Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Baịbụl, peeji nke mbụ ruo nke ise.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) ia isi nke 15 ¶1-14, na igbe dị na peeji nke 138
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 11 na Ekpere