Ọhụụ nke Na-eme Ka Okwukwe Sie Ike
Chetụgodị otú obi dị Jizọs mgbe ọ nụrụ ka Nna ya nke eluigwe si n’eluigwe kwuo na ihe ya masịrị ya n’oge ọhụụ nnwogha ahụ. O doro anya na o mere ka obi sie ya ike idi ahụhụ ọ na-aga ịta. Ọhụụ a mekwara ka okwukwe Pita, Jems na Jọn siekwa ike. O mere ka obi sie ha ike na Jizọs bụ Mesaya ahụ nakwa na ha mere nke ọma gee ya ntị. Mgbe ihe dị ka afọ iri atọ na abụọ gachara, Pita ka chetara ọhụụ a ha hụrụ na otú o si mee ka o jidekwuo “okwu amụma ahụ” n’aka.—2 Pita 1:16-19.
Ọ bụ eziokwu na anyị ahụghị ọhụụ a dị ịtụnanya n’onwe anyị, ma, anyị na-ahụ otú o si na-emezu. Jizọs bụ Eze dị ike na-achị achị ugbu a. N’oge na-adịghị anya, ọ ‘ga-enwezu mmeri ya,’ nke ga-eme ka e nwee ụwa ọhụrụ nke ndị ezi omume ga-ebi n’ime ya.—Mkpu. 6:2.
Olee otú amụma Baịbụl ndị ị hụrụla ka ha mezuru si mee ka okwukwe gị sikwuo ike?