Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Hụ Ndị Ezinụlọ Gị n’Anya

Hụ Ndị Ezinụlọ Gị n’Anya

Ịhụnanya na-ejikọta ezinụlọ ọnụ. Ọ bụrụ na ịhụnanya adịghị n’ezinụlọ, ọ ga-esiri ha ike ịdị n’otu ma na-emekọ ihe ọnụ. Olee otú ndị bụ́ di, ndị bụ́ nwunye, na ndị mụrụ ụmụ ga-esi na-egosi ndị ezinụlọ ha na ha hụrụ ha n’anya?

Di hụrụ nwunye ya n’anya ga na-eche banyere mkpa nwunye ya, ihe o chere, na otú obi dị ya. (Efe. 5:28, 29) Ọ ga na-egboro ezinụlọ ya mkpa ha, na-enyekwara ha aka ịbịaru Chineke nso. Ọ ga-ejidekwa n’aka na ha na-enwechi ofufe ezinụlọ anya. (1 Tim. 5:8) Nwaanyị hụrụ di ya n’anya ga-edo onwe ya n’okpuru di ya, ‘na-akwanyekwara di ya ùgwù nke ukwuu.’ (Efe. 5:22, 33; 1 Pita 3:1-6) Di na nwunye kwesịrị ịdị njikere ịna-agbaghara ibe ha kpamkpam. (Efe. 4:32) Ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya kwesịrị igosi na ha ji onye nke ọ bụla n’ime ha kpọrọ ihe. Ha kwesịkwara ịna-akụziri ha ka ha hụ Jehova n’anya. (Diut. 6:6, 7; Efe. 6:4) Olee nsogbu ndị ụmụ ha na-enwe n’ụlọ akwụkwọ? Gịnị ka ha na-eme iji zere ime ihe ọjọọ ndị ọgbọ ha na-achọ ka ha mee? Ọ bụrụ na ịhụnanya adị n’ezinụlọ, obi ga-eru mmadụ niile nọ na ya ala.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NỌGIDE NA-AHỤ NDỊ EZINỤLỌ GỊ N’ANYA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú di hụrụ nwunye ya n’anya si elekọta ya ma jiri ya kpọrọ ihe?

  • Olee otú nwaanyị hụrụ di ya n’anya si egosi na ọ na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu?

  • Olee otú nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya si akụnye Okwu Chineke n’ime ụmụ ha?