Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

“Gịnị Ka Jehova Bụ́ Chineke Gị Na-achọ n’Aka Gị?”

“Gịnị Ka Jehova Bụ́ Chineke Gị Na-achọ n’Aka Gị?”

Na-erubere Jehova isi n’ihi na ị na-atụ egwu ya ma hụ ya n’anya (Diut. 10:12; w09 10/1 10 ¶3-4)

Nrubeisi na-eme ka a gọzie anyị (Diut. 10:13; w09 10/1 10 ¶6)

Jehova chọrọ ka anyị bịaruo ya nso (Diut. 10:15; cl 16 ¶2)

Jehova anaghị amanye anyị amanye irubere ya isi, kama ọ chọrọ ka anyị hụ ya n’anya ma “si n’obi” anyị na-erubere ya isi. (Rom 6:17) Ndị họọrọ ife Jehova na-ebi ndụ kacha mma.