Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Mee Mkpebi Dị Mma Gbasara Mmanya Na-aba n’Anya

Mee Mkpebi Dị Mma Gbasara Mmanya Na-aba n’Anya

Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịna-ejide onwe ya n’ihe gbasara ịṅụ mmanya na-aba n’anya. (Ilu 23:20, 29-35; 1 Kọr. 6:9, 10) Ọ bụrụ na Onye Kraịst ekpebie na ọ ga-aṅụ mmanya na-aba n’anya, o kwesịghị ịṅụbiga ya okè. O kwesịghịkwa ịbụ ma ọ́ ṅụbeghị mmanya, ahụ́ agaghị ezu ya ike. Ọ ga-ezerekwa ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ. (1 Kọr. 10:23, 24; 1 Tim. 5:23) O nweghị onye kwesịrị ịna-amanye ndị ọzọ, karịchaa ndị na-eto eto, ka ha ṅụọ mmanya na-aba n’anya.

LEENỤ VIDIO BỤ́ CHEE GBASARA NSOGBU MMANYA NWERE IKE ỊKPATARA GỊ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị mere Onye Kraịst ọ bụla ji kwesị ịna-erube isi n’iwu ndị gbasara ịṅụ mmanya na-aba n’anya?—Rom 13:1-4

  • Gịnị mere na anyị ekwesịghị ikwe ka ndị ọzọ manye anyị ịṅụ mmanya na-aba n’anya?—Rom 6:16

  • Olee otú anyị nwere ike isi zere nsogbu ndị gbasara mmanya na-aba n’anya?